Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 5:36-42 Bible Nso (IGBOB)

36. Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.

37. Nna nke ziterem, Ya onwe-ya ab͕awo-kwa-ram àmà. Ọ dighi mb͕e ọ bula unu nuworo olu-Ya, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula unu huworo oyiyi-Ya.

38. Unu enweghi kwa okwu-Ya ka ọ nọgide nime unu: n'ihi na Onye Ya onwe-ya zitere, Onye ahu ka unu onwe-unu nēkweghi

39. Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;

40. unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu.

41. Anaraghi m otuto n'aka madu.

42. Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 5