Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 5:29-45 Bible Nso (IGBOB)

29. ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n'ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n'ọnwu nke ikpé.

30. Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.

31. Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie.

32. Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie.

33. Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà.

34. Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu.

35. Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n'ìhè-ya nwa oge.

36. Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.

37. Nna nke ziterem, Ya onwe-ya ab͕awo-kwa-ram àmà. Ọ dighi mb͕e ọ bula unu nuworo olu-Ya, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula unu huworo oyiyi-Ya.

38. Unu enweghi kwa okwu-Ya ka ọ nọgide nime unu: n'ihi na Onye Ya onwe-ya zitere, Onye ahu ka unu onwe-unu nēkweghi

39. Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;

40. unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu.

41. Anaraghi m otuto n'aka madu.

42. Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu.

43. Mu onwem abiawo n'aha Nnam, ma unu anaraghm: ọ buru na onye ọzọ gābia n'aha nke aka ya, onye ahu ka unu gānara.

44. Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n'aka ibe-unu, ma otuto nke si n'aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi?

45. Unu echèla na Mu onwem gēbo unu ebubo n'iru Nnam: otù onye di nēbo unu ebubo, bú Moses, onye unu onwe-unu tukwasiworo obi-unu na ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 5