Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 5:24-37 Bible Nso (IGBOB)

24. N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu.

25. N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu.

26. N'ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya:

27. O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu.

28. Ka ihe a ghara iju unu anya: n'ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n'ílì gānu olu-Ya,

29. ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n'ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n'ọnwu nke ikpé.

30. Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.

31. Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie.

32. Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie.

33. Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà.

34. Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu.

35. Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n'ìhè-ya nwa oge.

36. Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.

37. Nna nke ziterem, Ya onwe-ya ab͕awo-kwa-ram àmà. Ọ dighi mb͕e ọ bula unu nuworo olu-Ya, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula unu huworo oyiyi-Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 5