Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 5:21-27 Bible Nso (IGBOB)

21. N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu.

22. N'ihi na Nnam adighi-ekpe kwa madu ọ bula ikpé, kama O werewo ikpé nile nye Ọkpara-Ya;

23. ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.

24. N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu.

25. N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu.

26. N'ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya:

27. O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 5