Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n'ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n'ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha.