Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 3:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma otù nwoke nime ndi-Farisi di aha-ya bu Nikọdimọs, otù onye-isi nke ndi-Ju:

2. Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.

3. Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.

4. Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n'afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya?

5. Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke.

6. Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 3