2. ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu.
3. Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine.
4. Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi.
5. Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.
6. Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù.
7. Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu.
8. O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya.
9. Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu,
10. si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a.
11. Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.
12. Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.
13. Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem.
14. Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala:
15. O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru;
16. Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia.
17. Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam.
18. Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia?
19. Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.