isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 19 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere mb͕e ahu Pailat were Jisus, pia Ya ihe.

2. Ndi-agha we kpa okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, were kwa uwe odobo b͕okwasi Ya;

3. ha we nābiakute Ya, nāsi, Ekele, Eze ndi-Ju! ha nāpia kwa Ya ihe.

4. Pailat we pu kwa ọzọ n'èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n'èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.

5. Ya mere Jisus putara n'èzí, nēkpu okpu-eze ahu nke eji ogwu me, nēyi kwa uwe odobo ahu. Pailat we si ha, Le, Nwoke ahu!

6. Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n'obe: n'ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya.

7. Ndi-Ju zara ya, si, Ayi onwe-ayi nwere iwu, ma dika iwu ahu si di O kwesiri inwu ọnwu, n'ihi na O mere Onwe-ya Ọkpara Chineke.

8. Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu a, ọ tukariri egwu;

9. o we ba nime Pritoriọm ọzọ, we si Jisus, Òle ebe Gi onwe-gi si bia? ma ọ dighi ọziza Jisus zara ya.

10. Ya mere Pailat si Ya, Ì dighi-agwam okwu? Ì mataghi na m'nwere ike irapu Gi, m'nwe-kwa-ra ike ikpọgide Gi n'obe?

11. Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari.

12. Site na nka Pailat nāchọ uzọ irapu Ya: ma ndi-Ju tiri nkpu, si, Ọ buru na i rapu Onye a, i bughi eyì Sisa: onye ọ bula nke nēme onwe-ya eze nēkwu okwu imegide Sisa.

13. Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu ndia, o duputa Jisus n'èzí, we nọkwasi oche-ikpé n'ebe anākpọ Pavement, ma n'asusu Hibru, Gabata.

14. Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu!

15. Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, M'gākpọgide Eze-unu n'obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa.

16. Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n'aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n'obe.

17. Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n'Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n'asusu Hibru Gọlgọta:

18. ebe ha kpọgidere Ya n'obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n'akuku a otù n'akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n'etiti ha.

19. Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU.

20. Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n'ihi na ebe akpọgidere Jisus n'obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n'asusu Hibru, n'asusu Latin, n'asusu Grik.

21. Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju.

22. Pailat zara, si, Ihe m'deworo, edewom ya.

23. Ya mere ndi-agha, mb͕e ha kpọgidesiri Jisus n'obe, ha chiri uwe-Ya, kè ha òkè anọ, otù onye otù òkè otù onye otù òkè; ha chi-kwa-ra uwe-ime-Ya: ma uwe-ime ahu enweghi ọb͕ub͕a, akpara ya site n'elu we gazu n'aru uwe-ime ahu dum.

24. Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezue, nke si,Ha kère uwem nye onwe-ha,N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha fe-kwa-ra nzà.Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia.

25. Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso.

26. Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n'anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke!

27. Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n'oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n'ulo nke aka ya.

28. Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku.

29. Adọbara n'ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n'elu osisi hyssop, che Ya n'ọnu.

30. Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.

31. Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n'elu obe n'ubọchi-izu-ike (n'ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha.

32. Ya mere ndi-agha biara, tijie ogwe-ukwu nke onye mbu, na nke onye ọzọ, nke akpọgidere Ya na ya n'obe:

33. ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya:

34. otú ọ di, otù onye n'etiti ndi-agha were ube ma Ya n'akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta.

35. Onye huworo ya ab͕awo kwa àmà, àmà-ya bu kwa ezie: onye ahu nāmata kwa na o nēkwu ezi-okwu, ka unu onwe-unu we kwere kwa.

36. N'ihi na ihe ndia mere, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Agaghi-etiji otù ọkpukpu-Ya.

37. Ọzọ kwa, ihe ọzọ di iche edeworo n'akwukwọ nsọ si, Ha gēlegide Onye ahu Nke ha mapúru amapú.

38. Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n'ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya.

39. Nikọdimọs, onye biakutere Ya n'abali na mbu, bia-kwa-ra, nēweta myrrh na aloes agwara, ihe ra ka ọgu pound ise n'ọtùtù.

40. Ya mere ha were aru Jisus, ke ya n'ezi ákwà-ozu, ya na udá utọ ndia, dika ndi-Ju nēme n'ilì ozu.

41. Ma n'ebe akpọgidere Ya N'obe otù ubi ab͕ara ogige di; nime ubi ab͕ara ogige ahu ílì ọhu di kwa nke akātọb͕ọghi madu ọ bula nime ya.

42. Ya mere n'ebe ahu, n'ihi ubọchi Nkwadebe nke ndi-Ju, (n'ihi na ílì ahu di nso), ka ha tọb͕ọrọ Jisus.