19. Ọ buru na unu sitere n'uwa, uwa gāhu ihe nke aka ya n'anya: ma n'ihi na unu esiteghi n'uwa, kama Mu onwem rọputara unu nime uwa, n'ihi nka uwa nākpọ unu asì.
20. Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.
21. Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n'ihi aham, n'ihi na ha amataghi Onye ziterem.