Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 14:20-31 Bible Nso (IGBOB)

20. N'ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu.

21. Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.

22. Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa?

23. Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n'anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n'anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n'ebe ọ nọ.

24. Onye nādighi-ahum n'anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem.

25. Okwu ndia ka M'gwaworo unu, mb͕e Mu na unu nānọgide.

26. Ma Onye-nkasi-obi ahu, bú Mọ Nsọ, Onye Nnam gēzite n'aham, Onye ahu gēzí unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu.

27. Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.

28. Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku.

29. Ub͕u a agwawokwam unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere mb͕e ọ bula ọ gēru.

30. Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n'ub͕u a, n'ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem;

31. ma ka uwa we mara na anamahu Nnam n'anya, ka ọ mara kwa na dika Nnam nyerem iwu, otú ahu ka M'nēme. Bilienu, ka ayi si n'ebe a pua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 14