Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 11:44-54 Bible Nso (IGBOB)

44. Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.

45. Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju, ndi biakutere Meri, ndi le-kwa-ra ihe O mere, ha kwere na Ya.

46. Ma ufọdu n'etiti ha jekuru ndi-Farisi, kọrọ ha ihe Jisus mere.

47. Ya mere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi kpọrọ nnọkọ-ikpé ka ha zukọ, si, Gini ka ayi nēme? n'ihi na Nwoke a nēme ọtutu ihe-iriba-ama.

48. Ọ buru na ayi arapu Ya otú a, madu nile gēkwere na Ya: ndi Rom gābia kwa napu ebe nke ayi na mba nke ayi.

49. Ma otù onye n'etiti ha, bú Kaiafas, ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, si ha, Unu onwe-unu amataghi ihe ọ bula,

50. unu atuleghi kwa uche na ọ bara unu urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju, ka mba-ayi dum ghara ila kwa n'iyì.

51. Ma o kwughi nka site n'onwe-ya: kama ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, o buru amuma na Jisus gaje inwu anwu n'ọnọdu mba ahu;

52. ọ bughi kwa nání n'ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n'otù.

53. Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya.

54. Ya mere Jisus adighi-ejeghari n'iru ọra madu n'etiti ndi-Ju ọzọ, kama O si n'ebe ahu je ba n'ala nke di ọhia nso, ba n'obodo anākpọ Ifraim; O we nọgide n'ebe ahu, Ya na ndi nēso uzọ-Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 11