Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke.

2. Onye ahu na Chineke diri na mbu.

3. Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya.

4. Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu.

5. Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya.

6. Otù nwoke putara, onye ezitere site n'ebe Chineke nọ, aha-ya bu Jọn.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 1