Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jemes 5:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu.

2. Àkù-unu erewo uré, uwe nile unu aghọwo kwa ihe nla ripiaworo.

3. Ọla-edo-unu na ọla-ọcha-unu ab͕awo nchara; nchara-ha gāburu kwa unu ihe-àmà, ọ gēripia kwa anu-aru-unu dika ọku. Unu kpadoro àkù-unu na mb͕e ikpe-azu.

4. Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jemes 5