Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jemes 4:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. Genu nti, unu ndi nāsi, Ta ma-ọbu echi ka ayi gāga obodo a, nọ kwa n'ebe ahu otù arọ, zu kwa ahia, rita kwa urù:

14. ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.

15. Ma nke kwesiri unu ka unu kwue bu, Asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a ma-ọbu ihe ahu.

16. Ma otú ọ di, unu nānya isi n'oké okwu-unu: inya-isi nile di otú a bu ajọ ihe.

17. Ya mere onye matara ime ihe ọma, ma ọ meghi ya, ọ buru onye ahu nmehie.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jemes 4