Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Failimon 1:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.

8. N'ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n'iwu,

9. ma n'ihi ihu-n'anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m'bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a:

10. ariọm gi aririọ bayere nwa nkem, onye m'muru nime ab͕um, bú Ọnisimọs,

11. onye buri onye nābaghi n'ihe n'ebe i nọ n'oge gara aga, ma ub͕u a ọ bara gi n'ihe, ba-kwa-ram n'ihe:

12. onye m'nēzighachiri gi, ya onye-ya, nke ahu bu, obi nkem:

13. onye mu onwem nēzuberi ijide ka mu na ya nọdu, ka o we nējerem ozi n'ab͕u nke ozi ọma n'ọnọdu gi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Failimon 1