Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Failimon 1:18-25 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma ọ buru na o mejọrọ gi n'uzọ ọ bula, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula, gua ya n'ugwọ m'ji gi;

19. Mu onwem, bú Pọl, were aka nkem de ya n'akwukwọ a, mu onwem gākwughachi ya: ka m'ghara igwa gi na ọ bu kwa onwe-gi ka i jim n'ugwọ tukwasi ihe ọzọ.

20. E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n'aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist.

21. Ebe m'tukwasiworo obi n'iṅa-nti-gi anamedegara gi akwukwọ, n'ihi na amataram na i gēme ọbuná kari ihe m'nēkwu.

22. Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m'gānọ dika ọbìa: n'ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n'amara site n'ekpere-unu.

23. Epafras, onye adọkọro mu na ya n'agha nime Kraist Jisus, nēkele gi;

24. ọ bu kwa otú a Mak na Aristakọs na Dimas na Luk, bú ndi mu na ha nālukọ ọlu, nēkele unu.

25. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu. Amen.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Failimon 1