Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

3. Jọn 1:4-11 Bible Nso (IGBOB)

4. Enweghm ọṅù nke ka ihe ndia uku, bú inu ka umu nke akam nējeghari n'ezi-okwu ahu.

5. Onye m'huru n'anya, i nēme ihe kwesiri ntukwasi-obi n'ọlu ọ bula i luru n'ebe ndi bu umu-nna-ayi, ndi bu kwa ndi-ọbìa, nọ;

6. ndi b͕ara àmà ihu-n'anya-gi n'iru nzukọ Kraist: ndi i gēme nke-ọma idupu ha n'ije-ha dika o kwesiri imere Chineke:

7. n'ihi na ọ bu n'ihi Aha ahu ka ha puru, nānaraghi ihe ọ bula n'aka ndi mba ọzọ.

8. Ya mere ayi onwe-ayi ji ugwọ ikpọbata madu di otú a, ka ayi we buru kwa ndi soro ezi-okwu ahu nālukọ ọlu.

9. Edegaram nzukọ-unu ihe n'akwukwọ: ma Diọtrefis, onye ọ nātọ utọ ibu onye-isi n'etiti ha, anaraghi ayi nke-ọma.

10. N'ihi nka, ọ buru na abiam, m'gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n'iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n'ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist.

11. Onye m'huru n'anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 3. Jọn 1