Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

3. Jọn 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Okenye nēdegara Gaiọs akwukwọ, bú onye ahuru n'anya, onye mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu.

2. Onye m'huru n'anya, anamekpere Chineke ka ihe nile nāgara gi nke-ọma, ka i nwe kwa ezi ndu, dika ọ nāgara nkpuru-obi-gi nke-ọma.

3. N'ihi na aṅuririm ọṅu nke-uku, mb͕e umu-nna-ayi ufọdu biara we b͕a àmà ezi-okwu-gi, dika gi onwe-gi nējeghari n'ezi-okwu.

4. Enweghm ọṅù nke ka ihe ndia uku, bú inu ka umu nke akam nējeghari n'ezi-okwu ahu.

5. Onye m'huru n'anya, i nēme ihe kwesiri ntukwasi-obi n'ọlu ọ bula i luru n'ebe ndi bu umu-nna-ayi, ndi bu kwa ndi-ọbìa, nọ;

6. ndi b͕ara àmà ihu-n'anya-gi n'iru nzukọ Kraist: ndi i gēme nke-ọma idupu ha n'ije-ha dika o kwesiri imere Chineke:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 3. Jọn 1