Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Timọti 4:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Anamagwasi gi ike n'iru Chineke na Kraist Jisus, Onye gaje ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé, ewerekwam ngosi-Ya na ala-eze-Ya si gi;

2. kwusa okwu-Ya; tukwasi uche n'ọlu-gi n'oge kwesiri, ma-ọbu n'oge nēkwesighi; tu madu nmehie-ha n'anya, ba nba, riọ aririọ, n'ogologo-ntachi-obi nile na ozizí nile.

3. N'ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di;

4. ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu, ma ha gējehie ṅa nti akukọ-irò.

5. Ma gi onwe-gi, nēnwe anya-udo n'ihe nile, huju anya, lua ọlu nke onye nēzisa ozi ọma, jezu ozi-gi.

6. N'ihi na anāwusim ub͕u a dika àjà-ihe-ọṅuṅu, oge ulam eruwo kwa.

7. Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:

8. nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n'ikpe ikpé, gēnyeghachim n'ubọchi ahu: ma ọ bughi nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngosi-Ya n'anya.

9. Were inu-ọku-n'obi biakutem ọsọsọ:

10. n'ihi na Dimas rapuru náním, ebe ọ huru oge di ub͕u a n'anya, o we ga Tesalọnaika; Kresens gara Galetia, Taitọs gara Dalmetia.

11. Nání Luk nọyerem. Kuru Mak, duru ya ka o so gi onwe-gi bia: n'ihi na ọ bu onye baram n'ihe ijerem ozi.

12. Ma ezigaram Tikikọs n'Efesọs.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Timọti 4