Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Timọti 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, dika nkwa nke ndu ahu nke di nime Kraist Jisus si di,

2. nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.

3. Anameleke Chineke, Onye m'nēkpere site na nnam ochie-hà n'akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n'aririọm nile di n'ewepughi aka,

4. n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù;

5. ebe emerem ka m'cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m'kweye na o bi kwa nime gi.

6. Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nēchetara gi ka i me ka onyinye-amara nke Chineke nwuru ọku, bú nke di nime gi site n'ibikwasi aka abua nkem n'isi-gi.

7. N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Timọti 1