Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Pita 1:11-17 Bible Nso (IGBOB)

11. n'ihi na otú a ka agēnyezu unu n'àkù nbata ahu unu gābata nime ala-eze ebighi-ebi nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist.

12. N'ihi nka mb͕e dum agajem ichetara unu ihe ndia, ọ bu ezie na unu matara ha, emewo kwa ka unu guzosie ike n'ezi-okwu ahu nke dinyere unu.

13. Ma anamagu ya n'ihe ziri ezi, ka oge ra m'nọ n'ulo-ikwū a, ikpali unu n'ichetara unu;

14. ebe m'matara na ntupu nke ulo-ikwūm nka nābia ọsọsọ, ọbuná dika Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gosirim.

15. E, m'gānu ọku n'obi ka unu we nwe ike icheta ihe ndia n'oge nile ọ bula mb͕e m'lasiri.

16. N'ihi na ayi esoghi akukọ-irò nke eji amam-ihe kọ, mb͕e ayi mere ka unu mara ike na ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ma emere ayi ka ayi buru ndi huru idi-uku nke Onye ahu.

17. N'ihi na Ọ natara nsọpuru na ebube n'aka Chineke, bú Nna, mb͕e Ebube ahu nke kwesiri idi-uku mere ka olu di otú a dara Ya, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di Mu onwem ezi nma:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Pita 1