Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Tesalọnaika 3:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. ka ewe dọputa kwa ayi n'aka ajọ madu ndi nēmehie kwa; n'ihi na ọ bughi madu nile nwere okwukwe.

3. Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n'aka ajọ onye ahu.

4. Ma ayi atukwasiwo obi n'aru unu nime Onye-nwe-ayi, na unu nēme, gēme kwa, ihe nile ayi nēme n'iwu.

5. Ma Onye-nwe-ayi duzie obi-unu bà n'ihunanya nke Chineke, bà kwa na ntachi-obi nke Kraist-ayi.

6. Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna-ayi, n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādighi-agazi ije, ọ dighi-eje kwa dika ozizí ahu enyere n'aka-ha idebe nke ha natara n'aka-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Tesalọnaika 3