Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Tesalọnaika 3:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.

13. Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n'obi n'ime ihe ọma.

14. Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n'iru.

15. Unu agukwala ya n'onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna.

16. Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n'uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu.

17. Ekele nke mu Pọl nke m'ji aka nkem de, nke bu ihe-iriba-ama n'akwukwọ-ozi nile ọ bula: otú a ka m'nēde.

18. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Tesalọnaika 3