Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Tesalọnaika 2:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. Ub͕u a unu matakwara ihe nēb͕ochi, ka ewe kpughe ya n'oge nke aka ya.

7. N'ihi na ihe-omimi nke nmebi-iwu nālusi ọlu ike ub͕u a: nání rue mb͕e agēwepu onye ahu n'etiti, bú onye nēb͕ochi ub͕u a.

8. Mb͕e ahu ka agēkpughe kwa onye ahu nēmebi iwu, onye Onye-nwe-ayi Jisus gēwere iku-ume nke si n'ọnu-Ya puta b͕ue, were kwa ngosi nke ọbibia-Ya me ka ọ ghara idi irè;

9. bú onye ahu, nke ọbibia-ya di ka ilusi-ọlu-ike nke Setan n'ike nile ọ bula na ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche nke ugha,

10. n'aghughọ nile kwa nke ajọ omume n'ebe ndi nāla n'iyì nọ; n'ihi na ha anaraghi ihu-n'anya nke ezi-okwu nke-ọma, ka ewe zọputa ha.

11. N'ihi nka Chineke nēzitekwara ha ilusi-ọlu-ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahu:

12. ka ewe kpe ha nile ikpé, bú ndi nēkweghi ezi-okwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma.

13. Ma ayi onwe-ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi ndi Onye-nwe-ayi huru n'anya, n'ihi na Chineke rọputara unu site na mbu ka unu we nwe nzọputa nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ nēdo na ikwere ezi-okwu:

14. nke O sitere n'aka ozi ọma ayi kpọbata unu nime ya, ka unu we nweta ebube nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

15. Ya mere otú a, umu-nna-ayi, nēguzosinu ike, jidekwanu ozizí nile enyere n'aka idebe nke ezíri unu, ma-ọbu site n'okwu-ọnu-ayi, ma-ọbu site n'akwukwọ-ozi-ayi.

16. Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,

17. ka Ọ kasie obi-unu, me kwa ka ha guzosie ike n'ezi ọlu na ezi okwu nile ọ bula.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Tesalọnaika 2