Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 8:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. kama anamekwu n'uzọ nrata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọduru ha inwe n'oge di ub͕u a, ka ihe ndi ahu nwebigara ókè we meju kwa ihe fọduru unu inwe; ka nrata we di:

15. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya; onye chikọta-kwa-ra ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe.

16. Ma ekele diri Chineke, Onye nētiye otù inu-ọku ahu n'ihi unu n'obi Taitọs.

17. N'ihi na ọ nara aririọ-ayi nke-ọma n'ezie; ma ebe ọ nānu ọku n'obi kari ihe m'chère, o siri n'ebe a pua jekuru unu dika o zuputara n'onwe-ya.

18. Ayi ezìkọwo kwa ya na nwa-nna-ayi ahu onye otuto-ya n'ozi ọma ayi ruzuru nzukọ Kraist nile;

19. ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi:

20. ma ayi nēze nka, ka onye ọ bula ghara ita ayi uta n'oké onyinye-amara nka nke ayi nēje ozi ya:

21. n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa.

22. Ayi ezìkọwo kwa ha na nwa-nna-ayi, onye ayi nwaputara ọtutu mb͕e na ọ nānu ọku n'obi n'ọtutu ihe, ma ub͕u a ọ nānu kari ọku n'obi nke-uku, site n'oké ntukwasi-obi nke ọ nātukwasi n'aru unu.

23. Ma ọ buru na onye ọ bula aju ajuju bayere Taitọs, ọ bu onye mu na ya nēnwekọ ihe, buru kwa onye mu na ya nālukọrọ unu ọlu; ma-ọbu umu-nna-ayi, ha bu ndi-ozi nke nzukọ Kraist, ha bu otuto nke Kraist.

24. Ya mere nēgosinu ha n'iru nzukọ Kraist nile ihe gēgosi ihu-n'anya-unu na inya-isi-ayi bayere unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 8