Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 8:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọzọ, umu-nnam, ayi nēme ka unu mara amara Chineke nke enyeworo nime nzukọ Kraist nile nke Masedọnia;

2. na nime ọtutu nnwaputa nke nkpab͕u, nbabiga-ókè nke ọṅù-ha na ob͕eye-ọnu-ntu ha bu babigara ókè rue àkù nke afọ-ofufo-ha.

3. N'ihi na ka ike-ha ra, dika m'nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n'onwe-ha,

4. ha were ọtutu aririọ nāriọ ayi ka ayi nye ha amara nka na nnwekọ ije-ozi anējere ndi nsọ:

5. ha me-kwa-ra nka, ọ bughi dika ayi lere anya, kama ha buru uzọ were onwe-ha nye Onye-nwe-ayi, nye kwa ayi site n'ọchichọ Chineke.

6. Ya mere ayi riọrọ Taitọs, ka, dika ọ malitereri na mbu, ka ọ luzu kwa n'etiti unu amara nka otú a kwa.

7. Ma dika unu babigara ókè n'ihe nile, bú okwukwe, na okwu, na ihe-ọmuma, na inu-ọku-n'obi nile, na ihu-n'anya unu huru ayi, lezienu anya ka unu babiga kwa ókè n'amara nka.

8. Ekwughm n'uzọ inye iwu, kama n'iwere inu-ọku-n'obi nke ndi ọzọ nwaputa kwa ihu-n'anya-unu na ọ bu ezi ihu-n'anya.

9. N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.

10. Na nka ka m'nēnye kwa ìzùm: n'ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n'arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ.

11. Ma ub͕u a mezu-kwa-nu omume ahu; ka, dika obi di ọku ichọ achọ diri unu, ka ewe site n'ihe unu nwere mezu kwa ya otú a.

12. N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.

13. N'ihi na ekwughm nka, ka o we di ndi ọzọ nfé, ka nkpab͕u we di-kwa-ra unu:

14. kama anamekwu n'uzọ nrata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọduru ha inwe n'oge di ub͕u a, ka ihe ndi ahu nwebigara ókè we meju kwa ihe fọduru unu inwe; ka nrata we di:

15. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya; onye chikọta-kwa-ra ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 8