Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 7:3-7 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ bughi ima unu ikpé ka m'nēkwu ya: n'ihi na ekwuwom ya na mbu, na unu di ayi n'obi inwukọ ọnwu na idikọ ndu.

4. Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.

5. N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.

6. Otú ọ di, Onye ahu Nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke, were ọbibia Taitọs kasi ayi obi;

7. ọ bighi kwa nání ọbibia-ya, kama O were kwa nkasi-obi nke ejiri kasi ya obi n'aru unu we kasi ayi obi, mb͕e ọ nākọrọ ayi ọgugu m'gusiri unu ike, iru-újú-unu, ekworo unu kworom; ya mere m'ṅuriri ọṅu kari.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 7