Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 7:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.

2. Nyenu ayi uzọ n'obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula.

3. Ọ bughi ima unu ikpé ka m'nēkwu ya: n'ihi na ekwuwom ya na mbu, na unu di ayi n'obi inwukọ ọnwu na idikọ ndu.

4. Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.

5. N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.

6. Otú ọ di, Onye ahu Nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke, were ọbibia Taitọs kasi ayi obi;

7. ọ bighi kwa nání ọbibia-ya, kama O were kwa nkasi-obi nke ejiri kasi ya obi n'aru unu we kasi ayi obi, mb͕e ọ nākọrọ ayi ọgugu m'gusiri unu ike, iru-újú-unu, ekworo unu kworom; ya mere m'ṅuriri ọṅu kari.

8. N'ihi na asi na ọ bu ezie na ejim akwukwọ-ozim me ka o wuta unu, akwaghm uta, asi na ọ bu ezie na anamakwari uta; n'ihi na anamahu na akwukwọ-ozi ahu mere ka o wuta unu, ma asi na ọ bu ezie na ọ bu nání otù oge hour ka o wutara unu.

9. Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n'ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n'ayi yi iyì n'ihe ọ bula.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 7