isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma, dika ndi ayi na Ya nālukọ ọlu, ayi nāriọ kwa unu ka unu ghara inara amara Chineke n'efu,

2. (n'ihi na Ọ nāsi,N'oge anānara madu nke-ọma ka M'nuru olu-gi,Ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'yere gi aka:le, ub͕u a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ub͕u a bu ubọchi nzọputa):

3. ayi adighi-eme ihe-isu-ngọngọ ọ bula n'ihe ọ bula, ka aghara ita ije-ozi-ayi uta;

4. kama n'ihe nile ayi nēme ka madu mara ayi, dika ndi nējere Chineke ozi, nime oké ntachi-obi, nime nkpab͕u, nime nkpà, nime oké nkpà,

5. nime ihe-otiti, nime ulo-nkpọrọ, nime aghara, nime idọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nime imuru-anya, nime obubu-ọnu;

6. nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,

7. nime okwu nke ezi-okwu, nime ike nke Chineke; site n'ihe-agha nke ezi omume n'aka-nri na aka-ekpe,

8. site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;

9. dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;

10. dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile.

11. Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo.

12. Adighi-eme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà nime ayi, ma anēme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà n'obi nke unu.

13. Ma dika ugwọ-ọlu n'otù uzọ ahu (anamekwu dika anāgwa umum), ka eme kwa ka unu onwe-unu di obodobo n'obi-unu.

14. Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ?

15. Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita?

16. Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.

17. N'ihi nkaSinu n'etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche,ka Onye-nwe-ayi kwuru,Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka;Mu onwem gākpọbata kwa unu,

18. Buru kwa unu Nna,Unu onwe-unu gābu-kwa-ram umu-ndikom na umu-ndinyom,ka Onye-nwe-ayi kwuru, Nke puru ime ihe nile.