Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 4:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. ayi nēbughari n'aru-ayi mb͕e nile ob͕ub͕u nke Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'aru-ayi.

11. N'ihi na arara ayi onwe-ayi, bú ndi di ndu, nye n'aka ọnwu mb͕e nile n'ihi Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'anu-aru-ayi nke puru inwu anwu.

12. Ya mere ọnwu nālusi ọlu ike nime ayi, ma ndu nālusi ọlu ike nime unu.

13. Ma ebe ayi nwere otù mọ nke okwukwe ahu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di, Ekwerem, n'ihi ya ka m'kwuru; ayi onwe-ayi kwere kwa, ọ bu kwa n'ihi ya ka ayi nēkwu;

14. ebe ayi matara na Onye ahu Nke mere ka Onye-nwe-ayi Jisus si n'ọnwu bilie, na Ọ gēme kwa ka ayi so Jisus si n'ọnwu bilie, Ọ gēche kwa ayi na unu n'iru Onwe-ya.

15. N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.

16. N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi.

17. N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi;

18. ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n'ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 4