Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 3:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. N'ihi na asi na ije-ozi nke ọmuma-ikpé bu ebube, ije-ozi nke ezi omume gēnwebiga ebube ókè kari nke-uku.

10. N'ihi na ihe emeworo ka ọ di ebube, emeghi ya ka ọ di ebube n'akuku a n'ezie, n'ihi ebube ahu nke kariri nke-uku.

11. N'ihi na asi na ihe anēme ka ọ ghara idi irè ji ebube bia, ihe nādigide dikariri n'ebube nke-uku.

12. Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku,

13. ayi adighi kwa ka Moses, onye nēkpudo ihe-nkpudo n'iru-ya, ka umu Israel we ghara ilegide anya rue ọgwugwu ihe ahu anēme ka ọ ghara idi irè:

14. ma emere ka uche-ha ma etili: n'ihi na rue ubọchi ta n'ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist.

15. Ma rue ubọchi ta, mb͕e ọ bula anāgu akwukwọ Moses, ihe-nkpudo nādigide n'obi-ha.

16. Ma mb͕e ọ bula o gēchigharikute Onye-nwe-ayi, ewepu ihe-nkpudo ahu.

17. Ma Onye-nwe-ayi bu Mọ ahu: ma ebe Mọ nke Onye-nwe-ayi nọ, n'ebe ahu ka madu nwere onwe-ha.

18. Ma ayi onwe-ayi nile ebe ayi were iru nke ekpupuworo ihe-nkpudo nēgosi ebube nke Onye-nwe-ayi dika enyo, anēnwogha ayi rue n'otù onyinyo ahu site n'ebube rue ebube, ọbuná dika anēnye ya site n'Onye-nwe-ayi, bú Mọ Nsọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 3