isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 13 Bible Nso (IGBOB)

1. Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.

2. Agwawom ha n'oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n'oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m'nọ n'etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m'gaghi-eme ebere;

3. ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:

4. n'ihi na esitere n'adighi-ike kpọgide Ya n'obe, ma O sitere n'ike Chineke nādi ndu. N'ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n'ike Chineke n'ebe unu nọ so Ya di ndu.

5. Nānwanu onwe-unu, ma unu di n'okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju.

6. Ma anamele anya na unu gāmara na ayi onwe-ayi abughi ndi ajuru aju.

7. Ma ayi nēkpere Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọ ọ bula; ọ bughi ka ayi onwe-ayi we puta ìhè, na ayi bu ndi anwaputara, kama ka unu onwe-unu we nēme ihe ọma, ka ayi onwe-ayi we di kwa ka ndi ajuru aju.

8. N'ihi na ayi apughi ime ihe ọ bula megide ezi-okwu, kama ayi nēmere ezi-okwu ihe nile.

9. N'ihi na ayi nāṅuri ọṅu, mb͕e ọ bula ayi onwe-ayi nādighi ike, ma unu onwe-unu di ike: nka ka ayi nēkpe-kwa-ra Chineke, bú ka eme ka unu zu okè.

10. N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.

11. Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.

12. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.

13. Ndi nsọ nēkele unu.

14. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.