Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 11:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Dika ezi-okwu nke Kraist di nimem, agaghi-eb͕ochi inya-isi a nimem n'akuku nile nke Akaia.

11. N'ìhi gini? ọ̀ bu n'ihi na ahughi m unu n'anya? Chineke matara.

12. Ma ihe m'nēme ka m'gēme kwa, ka m'we bipuru ndi nāchọ ihe ha gēji megidem ihe ahu ha ji megidem; ha ewe hu na ha di kwa ka ayi onwe-ayi n'ihe ha nānya isi.

13. N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist.

14. Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè.

15. Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di.

16. Asim ọzọ, Ka madu ọ bula ghara ichè na abum onye nēnweghi uche: ma ọ buru na unu emeghi otú a, otú ọ di naranum nke-ọma dika onye nēnweghi uche, ka mu onwem we nya kwa isi nke-ntà.

17. Ihe m'nēkwu, ekwughi m dika Onye-nwe-ayi gēkwu, kama ọ bu dika n'enweghi-uche, n'ihe m'dabere we nānya isi.

18. Ebe ọtutu madu nānya isi n'uzọ anu-aru, mu onwem gānya kwa isi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 11