Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 11:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na unu gānagidem n'okwu ntà nke sitere n'enweghi-uche: ma unu nānagidem n'ezie.

2. N'ihi na ejim ekworo Chineke nēkworo unu: n'ihi na ejikọrọm unu na otù di, ka m'we che unu n'iru Kraist dika nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú nke anēmerughi.

3. Ma anamatu egwu, ma ọ nwere uzọ ọ bula agēmebi uche-unu ka unu pua n'afọ-ofufo na idi-ọcha nke di n'ebe Kraist nọ, dika agwọ ahu were aghughọ-ya ghọb͕ue Iv.

4. N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma.

5. N'ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi.

6. Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n'uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n'uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n'ihe nile ọ bula n'etiti madu nile.

7. Ma-ọbu ọ̀ bu nmehie ka m'mehiere, mb͕e m'wedara onwem n'ala ka ewe welie unu onwe-unu elu, n'ihi na ezirim unu ozi ọma nke Chineke n'onyinye-efu?

8. Anapurum ihe n'aka nzukọ Kraist ọzọ, nānara ha ego-ọlu ka m'we jere unu ozi;

9. mb͕e m'nọ-kwa-ra n'etiti unu, nọ kwa na nkpà, abughi m onye ọ bula ibu arọ́; n'ihi na umu-nna-ayi, mb͕e ha si na Masedọnia bia, ha mezuru ihe nke fọdurum inwe; edebe-kwa-ram onwem n'uzọ nile ọ bula ka m'ghara inyib͕u unu, otú a ka m'gēdebe kwa onwem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 11