Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 10:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mu onwem Pọl ji idi-nwayọ na obi-ọma nke Kraist nāriọ unu, mu onye nādi ala n'iru unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, ma mb͕e m'nānọghi enwem obi-ike n'ebe unu nọ:

2. ma ariọm unu, ka m'ghara inwe obi-ike mb͕e m'nọ n'etiti unu na ntukwasi-obi ahu nke m'nāgu na m'gēji nwe anya-ike imegide ufọdu, ndi nāgu ayi dika ndi nējeghari dika anu-aru-ayi si chọ.

3. N'ihi na ọ bu ezie na ayi nējeghari n'anu-aru, ma ayi adighi-ebu agha dika anu-aru si ebu:

4. (n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike);

5. ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;

6. ayi nānọ kwa dika ndi edoziworo ikpeputa aṅaghi-nti nile n'ìhè, mb͕e ọ bula agēmezu iṅa-nti-unu.

7. Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa.

8. N'ihi na asi na ọ bu ezie na m'gānyabiga isi ókè kari bayere ike-ayi (nke Onye-nwe-ayi nyere iwuli unu elu dika ulo, ọ bughi kwa iweda unu), agaghi-eme ka ihere mem:

9. ka m'we ghara idi unu ka agāsi na ejim akwukwọ-ozim nile me ka unu tua oké egwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 10