Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 1:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa:

7. olile-anya-ayi bayere unu nēguzosi kwa ike; ebe ayi matara na, dika unu bu ndi nēnwekọ ahuhu nile, otú a ka unu nēnwekọ kwa nkasi-obi ahu.

8. N'ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n'Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu:

9. e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie:

10. Onye dọputara ayi n'oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ;

11. ebe unu nēyekọ kwa aka n'ihi ayi n'aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n'ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n'aka ọtutu madu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 1