Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Timọti 6:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. n'ihi na ayi ewetaghi ihe ọ bula n'uwa, ọ bu kwa n'ihi na ayi apughi iwere ihe ọ bula pua nime ya;

8. ma ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe ib͕okwasi n'aru, afọ gēju ayi n'ihe ndia.

9. Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n'ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n'iyì.

10. N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.

11. Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.

12. Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà.

13. Anamenye gi iwu n'iru Chineke, Onye nēme ka ihe nile di ndu, ya na n'iru Kraist Jisus, Onye b͕ara àmà nkwuputa ọma ahu n'iru Pọntiọs Pailat;

14. ka gi onwe-gi debe ihe ahu enyere n'iwu, nēnweghi ntupọ, onye anādighi-akalu akalu, rue ngosi nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Timọti 6