Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Timọti 5:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n'anya n'iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu.

21. Anamagwasi gi ike n'iru Chineke, na n'iru Kraist Jisus, na n'iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mb͕e i kānughi, ghara kwa ime ihe ọ bula n'uzọ isọ-anya.

22. Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.

23. Abu-kwa-la onye nāṅu nání miri ọzọ, kama nāṅu nwantinti manya-vine n'ihi afọ-gi na nriaria nke nāria gi ọtutu mb͕e.

24. Nmehie madu ufọdu nāputa ìhè, n'ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n'azu.

25. Otú ahu, ọlu nile nke di nma nāputa kwa ìhè; apughi kwa izobe ọlu nke di iche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Timọti 5