Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Timọti 5:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí.

18. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Na, Onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya.

19. Anarala ebubo anēbo okenye, ma-ọbughi n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ.

20. Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n'anya n'iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu.

21. Anamagwasi gi ike n'iru Chineke, na n'iru Kraist Jisus, na n'iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mb͕e i kānughi, ghara kwa ime ihe ọ bula n'uzọ isọ-anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Timọti 5