Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Timọti 4:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,

2. site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha;

3. ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara.

4. N'ihi na ihe nile ọ bula Chineke kère di nna, ọ dighi kwa ihe ọ bula agāju, ma ọ buru na ewere ekele nara ya:

5. n'ihi na esitere n'okwu Chineke na ekpere do ya nsọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Timọti 4