Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Timọti 2:10-15 Bible Nso (IGBOB)

10. kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma.

11. Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile.

12. Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ.

13. N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv;

14. ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie:

15. ma agēsite n'ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n'anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Timọti 2