Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Timọti 2:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere ihe mbu m'nādusi ọdu ike bu, ka anāriọ aririọ, kpe kwa ekpere, riọ kwa aririọ anāriọrọ ndi ọzọ, kele kwa ekele, n'ihi madu nile;

2. n'ihi ndi-eze na ndi nile nọ n'ọnọdu di elu; ka ayi we biri obi udo na nke di nwayọ nime nsọpuru-Chineke nile na ikwesi-nsọpuru nile.

3. Nka di nma buru kwa ihe agānara nke-ọma n'iru Onye-nzọputa-ayi, bú Chineke;

4. Onye nāchọ ka azọputa madu nile, ka ha biaru kwa nmazu nke ezi-okwu.

5. N'ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n'ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus,

6. Onye nyere Onwe-ya ka Ọ buru ihe-nb͕aputa n'ihi madu nile; nke agāb͕a àmà-ya n'oge nke aka ya;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Timọti 2