Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 5:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi.

8. Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:

9. ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa.

10. Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.

11. Ọ bu Ya nwe ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

12. Site n'aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m'nāgu ya, ka m'nēdegara unu akwukwọ n'okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n'ezie: nēguzosinu ike nime ya.

13. Nwanyi ahu nke nọ na Babilon, nke soro unu buru onye arọputaworo, nēkele unu; nwam, bú Mak, nēkele kwa unu.

14. Werenu isutu-ọnu nke ihu-n'anya nēkelerita onwe-unu.Udo diri unu nile ndi nọ nime Kraist.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 5