Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 3:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.

8. Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:

9. ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

10. N'ihi na,Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya,Na ihu ezi ubọchi,Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:

11. Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.

12. N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di:Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 3