Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 3:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.

12. N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di:Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.

13. Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe?

14. Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;

15. kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu:

16. ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.

17. N'ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n'ihi na unu nēme ezi ihe kama n'ihi na unu nēme ihe ọjọ.

18. N'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n'ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n'ihi na emere ka Ọ nwua anwu n'anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya;

19. nke ọ bu kwa nime ya ka Ọ gara we kwusara ndi-mọ nọ n'ulọ-nkpọrọ okwu,

20. ndi nēkweyeghi n'oge gara aga, mb͕e ogologo-ntachi-obi Chineke nēchesi ike n'ubọchi Noa, mb͕e anēdozi ub͕o, nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya:

21. bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;

22. Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 3