Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 3:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu;

2. mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu.

3. Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe;

4. kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke.

5. N'ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n'oge gara aga, nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha:

6. dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula.

7. Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.

8. Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:

9. ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

10. N'ihi na,Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya,Na ihu ezi ubọchi,Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:

11. Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.

12. N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di:Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.

13. Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe?

14. Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 3