Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 2:13-22 Bible Nso (IGBOB)

13. Donu onwe-unu n'okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n'ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n'ike n'elu unu;

14. ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.

15. N'ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n'ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu:

16. dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke.

17. Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n'anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu.

18. Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n'okpuru ndi-nwe-unu n'egwu nile; ọ bughi nání n'okpuru ndi bu ezi madu ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama ọ bu kwa n'okpuru ndi b͕agọrọ ab͕agọ.

19. N'ihi na nka bu ihe-ekele, ma ọ buru na onye ọ bula nātachi obi n'ihe-nwuta di iche iche n'ihi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, nāhu ahuhu nke nēzighi ezi.

20. N'ihi na àha otuto gini di ya, ma ọ buru na, mb͕e unu nēmehie, mb͕e eti kwa unu aka, unu atachi obi na ya?

21. N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:

22. Onye ọ dighi nmehie ọ bula O mere, ahughi kwa aghughọ n'ọnu-Ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 2