Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 1:22-25 Bible Nso (IGBOB)

22. Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:

23. ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n'okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ.

24. N'ihi na,Anu-aru nile di ka ahihia,Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia.Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:

25. Ma okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.Nka bu kwa okwu nke ozi ọma ahu ezisara unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 1