Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 1:15-25 Bible Nso (IGBOB)

15. kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n'ibi-obi nile di iche iche;

16. n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di.

17. Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa:

18. ebe unu matara na ejighi ihe apuru imebi, bú ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo, b͕aputa unu n'ibi-obi efu unu nke nna-unu-hà nyere unu n'aka ibi;

19. kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n'aru, bú ọbara nke Kraist:

20. Onye eburu uzọ mara n'ezie mb͕e akātọghi ntọ-ala nke uwa, ma emere ka Ọ puta ìhè n'ọgwugwu oge ndia n'ihi unu,

21. ndi sitere n'aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n'ebe Chineke nọ.

22. Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:

23. ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n'okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ.

24. N'ihi na,Anu-aru nile di ka ahihia,Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia.Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:

25. Ma okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.Nka bu kwa okwu nke ozi ọma ahu ezisara unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 1