Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 1:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.

12. Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n'ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n'elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha.

13. N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;

14. dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n'amaghi-ihe-unu:

15. kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n'ibi-obi nile di iche iche;

16. n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 1